Velile
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | South Africa |
| Aha ezinụlọ ya | Mchunu |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1973 |
| Ebe ọmụmụ | KwaMashu |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | stage actor, onye na-abụ abụ |
| Ebe ọrụ | Johannesburg |

Velile (amụrụ Velile Mchunu n'afọ 1973 na KwaMashu, Natal, South Africa ) bụ onye South Africa na-agụ egwu pop na onye na-eme ihe nkiri. A maara ya karịchaa site na egwu "Helele", nke RTL (redio French) na telivishọn Switzerland jiri ruọ ọru na ngosi nke Football World Cup n'afọ 2010 na South Africa, ma na Germany dị ka onye na-eme ihe nkiri na mmepụta Hamburg nke egwu The Lion King .[1][2]
Akụkọ ndụ
Mchunu tolitere n'obodo dị nso n'obodo Durban nke South Africa ma gaa ụlọ akwụkwọ ihe nkiri na "Committed Artist Academy" na Johannesburg. N'afọ 1999, ya na Stevie Wonder na Michael Jackson gosiputara n'oge ụbọchị ọmụmụ Nelson Mandela. Na Hamburg, ọ rụrụ ọrụ dị mkpa nke shaman Rafiki na egwu "The Lion King" ruo ọtụtụ afọ. Na-nsote, ọ pụtara na egwu Sarafina yana ihe nkiri South Africa nke afọ 1992 nke otu aha ahụ, banyere nwa okorobịa isi ojii South Africa na-anwa ike ya maka nnwere onwe n'oge ịkpa ókè agbụrụ. Ọ gara njem iji mee ihe ngosi nke egwu Izidumo na Ipi Ntombi. Ọ pụtakwara na njem 2006 dị ka onye soloist nye n'egwú dị iche iche.[1][2][3]
Discografị
Albọm
- Tales from Africa (2010)
- Lion Queen (2011)
Ndi dị otu
- Helele (Velile & Safri Duo) (2010)
- Kuyabanda (2010)
- Injabulo (2011)
Edensibia
- ↑ 1.0 1.1 Germany. Unser Veranstaltungstipp – Soko und Velile spielen afrikanischen Jazz (de-DE). Hannoversche Allgemeine Zeitung. Archived from the original on 2017-12-01. Retrieved on 2017-11-18.
- ↑ 2.0 2.1 Ein Song und seine Geschichte: Velile Mchunu & Safri Duo: "Helele" | Musik-Center | BAYERN 3 | BR. Br-online (2010-07-07). Archived from the original on 2010-07-07. Retrieved on 2017-11-18.
- ↑ Universal Music Deutschland: Deine Stars, deine Musik, alle Genres (de-DE). www.universal-music.de. Retrieved on 2017-11-18.
Content Disclaimer
Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.
- The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
- There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
- It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
- Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
- Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.