Patrick Chuka
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha enyere | Patrick |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 17 Maachị 2000 |
| Ebe ọmụmụ | Victoria Island, Lagos |
| Ọrụ ọ na-arụ | omenkà, draftsperson |
| Ebe agụmakwụkwọ | Federal Government College Odogbolu |
| Webụsaịtị | http://artistchuka.com/ |
| Nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Patrick Chukwuka Onyejiaka (a mụrụ n'ụbọchị nke ịrị na asaa n'ọnwa Maachị n'afọ 2000), onye a maara dịka Patrick Chuka ma ọ bụ ArtistChuka, bụ onye na-ese ihe na Naijiria nke jị icheku ọkụ na pen ballpoint na-arụ oru. Ọ na-ejikwa mmanụ, pastel na acrylic ese ihe, na-elekwasị anya na nka ya na eziokwu na akụkụ ụfọdụ nke hyperrealism.[1]
Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ
A mụrụ Chuka na Victoria Island, Lagos Steeti n'ime ezinụlọ mmadụ anọ, ebe ọ bụ nwa mbụ. Ọ bụ onye Abba, Nwangele, Imo State, Nigeria. N'ihi nsogbu ezinụlọ mgbe ọ na-etolite, ezinụlọ ya kwagara ọtụtụ ebe, na-amanye ya ịgbanwe site n'otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị gaa na nke ọzọ. Site na 2010 ruo 2011, ọ gara Federal Government College, Odogbolu, Ogun State, Nigeria maka agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya, ọ kwagara Top Highflyer College, Isolo, Lagos State, site na 2012 ruo 2014, tupu ọ kwaga ọzọ na Weenoble International School, Ejigbo, Lagos State, ebe o mechara gụchaa na 2015. Ọ malitere ime nka mgbe ọ dị afọ iri na ise, ozugbo ọ gụsịrị akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Chuka mechara kwaga United States ya na ezinụlọ ya na 2018.[2] Ugbu a, ọ bụ nwa akwụkwọ nke Berkeley City College, Berkeley, California, USA, ebe ọ na-amụ Biology.[1][3]
Ụdị na nkà ihe ọmụma
Chuka jị icheku ọkụ na pen ballpoint arụ ọrụ. Ọ na-ese ihe na mmanụ, pastel, acrylic ma na-akpụ ihe. Ọ dọọrọ uche gaa n'isiokwu ndị na-aga n'ihu dịka feminism, ikike alụmdi na nwunye maka ndị na-eto eto, ikike LGBTQ na ịha nhata nwoke na nwanyị na nka ya.[1][4]
N'afọ 2018, ọ kọwara ihe mere o ji ewe iwe mgbe ọ na-agụ Bible. Ọ katọrọ Solomọn maka ịrịọ Chineke maka Amamihe.[5]
Atụmatụ
Na 16 Jenụwarị 2018, Chuka nwere eserese ya a gụnyere na Brittle Paper na "14: An Anthology of Queer Art, Vol. 2: The Inward Gaze."[6]
N'abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba, e gosipụtara Patrick na BBC.[7]
Ebensidee
- ↑ 1.0 1.1 1.2 Biography of Patrick Chuka. ArtistChuka. Archived from the original on 27 August 2019. Retrieved on 27 August 2019.
- ↑ Artist Spotlight: Chuka Pencils. The Nygerian. Archived from the original on 27 August 2019. Retrieved on 27 August 2019.
- ↑ Patrick Chuka – The Visual Artist. Creative Debuts. Archived from the original on 27 August 2019. Retrieved on 27 August 2019.
- ↑ Patrick Chuka MTLS. Maple Tree Literary Supplement Canada. Retrieved on 27 August 2019.
- ↑ Nigerian artist explains why he gets angry when reading the Bible. Legit.ng (8 August 2018). Archived from the original on 27 August 2019. Retrieved on 27 August 2019.
- ↑ 14: An Anthology of Queer Art, Vol. 2: "The Inward Gaze". Brittle Paper (16 January 2018). Retrieved on 27 August 2019.
- ↑ "Patrick Chuka", BBC. Retrieved on 30 October 2020.
Content Disclaimer
Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.
- The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
- There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
- It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
- Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
- Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.